1 Samuel 26:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.”
1 Samuel 26:8 in English
1 Samuel 26:8 · Berean Standard Bible
Abishai said to David, “Today God has delivered your enemy into your hand. Now, therefore, please let me thrust the spear through him into the ground with one stroke. I will not need to strike him twice!”
Context
6Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya* onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?”
Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.” 7Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra. 8Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.” 9Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?” 10Ọ sịrị, “Nʼezie dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.