Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.

1 Samuel 25:6 in English

1 Samuel 25:6 · Berean Standard Bible

and say to him, ‘Long life to you, and peace to you and your house and to all that belongs to you.

Context

4Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya, 5o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m. 6Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere. 7“ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel. 8Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.