Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ.

1 Samuel 25:38 in English

1 Samuel 25:38 · Berean Standard Bible

About ten days later, the LORD struck Nabal dead.

Context

36Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ. 37Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume. 38Mgbe abalị iri gafere, Onyenwe anyị tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ. 39Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.” Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya. 40Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.