Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.

1 Samuel 25:33 in English

1 Samuel 25:33 · Berean Standard Bible

Blessed is your discernment, and blessed are you, because today you kept me from bloodshed and from avenging myself by my own hand.

Context

31onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.” 32Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m. 33Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ. 34Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.” 35Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.