Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”

1 Samuel 25:17 in English

1 Samuel 25:17 · Berean Standard Bible

Now consider carefully what you must do, because disaster looms over our master and all his household. For he is such a scoundrel that nobody can speak to him!”

Context

15Ma ndị ikom ndị a* mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị. 16Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ. 17Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.” 18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu. 19Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.