Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.

1 Samuel 25:14 in English

1 Samuel 25:14 · Berean Standard Bible

Meanwhile, one of Nabal’s young men informed Nabal’s wife Abigail, “Look, David sent messengers from the wilderness to greet our master, but he scolded them.

Context

12Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru. 13Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!*” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche. 14Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba. 15Ma ndị ikom ndị a* mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị. 16Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.