1 Samuel 25:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.
1 Samuel 25:10 in English
1 Samuel 25:10 · Berean Standard Bible
But Nabal asked them, “Who is David? Who is this son of Jesse? Many servants these days are breaking away from their masters.
Context
8Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ” 9Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa. 10Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ. 11M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?” 12Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.