1 Samuel 24:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”
1 Samuel 24:21 in English
1 Samuel 24:21 · Berean Standard Bible
So now, swear to me by the LORD that you will not cut off my descendants or wipe out my name from my father’s house.”
Context
19Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa. 20Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel. 21Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.” 22Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.
24:17 Jen 38:26
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.