Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn?

1 Samuel 23:19 in English

1 Samuel 23:19 · Berean Standard Bible

Then the Ziphites came up to Saul at Gibeah and said, “Is not David hiding among us in the strongholds at Horesh, on the hill of Hachilah south of Jeshimon?

Context

17Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.” 18Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya. 19Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn? 20Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.” 21Sọl zara ha sị, “Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.