1 Samuel 22:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret.
1 Samuel 22:5 in English
1 Samuel 22:5 · Berean Standard Bible
Then the prophet Gad said to David, “Do not stay in the stronghold. Depart and go into the land of Judah.” So David left and went to the forest of Hereth.
Context
3Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?” 4Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike. 5Ma Gad onye amụma sịrị Devid, “Anọgidela nʼebe ahụ e wusiri ike, kama laghachi nʼala Juda.” Ya mere, Devid biliri gaa nʼoke ọhịa Heret. 6Ugbu a Sọl nụrụ na achọtala ebe Devid na ndị ikom na-eso ya nọ. Sọl, onye ji ùbe ya nʼaka nọdụrụ ala nʼokpuru osisi tamarisk nke dị nʼugwu dị na Gibea. Ndị ozi ya guzokwa gburugburu ya. 7Sọl gwara ha sị, “Geenụ ntị unu ndị ikom Benjamin! Ọ bụ unu niile ka nwa Jesi ga-enye ala ubi na ubi vaịnị? Ọ bụ unu niile ka ọ ga-eme ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.