1 Samuel 22:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya.
1 Samuel 22:2 in English
1 Samuel 22:2 · Berean Standard Bible
And all who were distressed or indebted or discontented rallied around him, and he became their leader. About four hundred men were with him.
Context
1Devid hapụrụ Gat gbaba nʼọgba nkume Adulam. Mgbe ụmụnne ya ndị ikom na ndị ezinaụlọ nna ya nụrụ nke a, ha jekwuru ya nʼebe ahụ. 2Ndị ọzọ malitekwara ịbịakwute ya nʼebe ahụ, ndị niile nọ na mkpagbu dị iche iche, ndị ji ụgwọ, na ndị ọchịchị Sọl na-adịghị mma. Ha niile jekwuru ya. Ọ dịghị anya Devid ghọọrọ onyendu ha. Ihe ruru narị mmadụ anọ so ya. 3Devid sitere nʼebe ahụ jee Mizpa dị na Moab rịọọ eze obodo ahụ sị, “Biko, ị ga-ekwe ka nna m na nne m pụta bịa biri nʼetiti unu tutu ruo mgbe m matara ihe Chineke na-aga imere m?” 4Ya mere, ọ hapụrụ ha ka ha nọdụ na nke eze Moab. Ha na ya nọgidere oge niile Devid bi nʼebe ahụ e wusiri ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.