1 Samuel 22:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.”
1 Samuel 22:10 in English
1 Samuel 22:10 · Berean Standard Bible
Ahimelech inquired of the LORD for him and gave him provisions. He also gave him the sword of Goliath the Philistine.”
Context
8Ọ bụ ya mere unu ji dịnyere ya imegide m? Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu gwara m na nwa m na nwa Jesi gbara ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu ihe gbasara m na-emetụ nʼobi ịgwa m na nwa m nwoke akpaliela ohu m imegide m, ichebiri m nʼụzọ, dịka o mere nʼụbọchị taa.” 9Ma Doeg onye Edọm, onye so ndị ozi Sọl guzo nʼebe ahụ kwuru sị, “Ahụrụ m mgbe nwa Jesi bịakwutere Ahimelek, nwa Ahitub na Nob. 10Ahimelek jụtaara ya ase site nʼaka Onyenwe anyị, ma nyekwa ya ihe oriri na mma agha Golaịat onye Filistia.” 11Mgbe ahụ, eze Sọl zipụrụ ozi nye Ahimelek nwa Ahitub na ndị ezinaụlọ nna ya niile, ndị bụ ndị nchụaja na Nob. Ha niile bịara guzo nʼihu eze. 12Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.”
Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.