Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”

1 Samuel 20:9 in English

1 Samuel 20:9 · Berean Standard Bible

“Never!” Jonathan replied. “If I ever found out that my father had evil intentions against you, would I not tell you?”

Context

7Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ. 8Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?” 9Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?” 10Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?” 11Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.