1 Samuel 20:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri.
1 Samuel 20:24 in English
1 Samuel 20:24 · Berean Standard Bible
So David hid in the field, and when the New Moon had come, the king sat down to eat.
Context
22Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị. 23Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.” 24Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri. 25Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya. 26Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha.* Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.