1 Samuel 20:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
1 Samuel 20:13 in English
1 Samuel 20:13 · Berean Standard Bible
But if my father intends to bring evil on you, then may the LORD punish me, and ever so severely, if I do not tell you and send you on your way in safety. May the LORD be with you, just as He has been with my father.
Context
11Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa. 12Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata. 13Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m. 14Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ. 15E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.