Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị.

1 Samuel 2:34 in English

1 Samuel 2:34 · Berean Standard Bible

And this sign shall come to you concerning your two sons Hophni and Phinehas: They will both die on the same day.

Context

32Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. 33Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi. 34“ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. 35Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. 36Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ” 2:1 Nʼebe a, mpi na-akọwa maka ike 2:10 Maọbụ, mpi 2:15 Nʼiwu e nyere banyere ịchụ aja, abụba na anụ niile abụba kpuchiri ka a na-akpọ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Lev 3:3-5,16; 4:8-10

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.