1 Samuel 19:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
1 Samuel 19:16 in English
1 Samuel 19:16 · Berean Standard Bible
And when the messengers entered, there was the idol in the bed with the quilt of goats’ hair on its head.
Context
14Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.” 15Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.” 16Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ. 17Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?”
Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ” 18Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.