Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.”

1 Samuel 19:11 in English

1 Samuel 19:11 · Berean Standard Bible

Then Saul sent messengers to David’s house to watch him and kill him in the morning. But David’s wife Michal warned him, “If you do not run for your life tonight, tomorrow you will be dead!”

Context

9Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara, 10Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ. 11Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.” 12Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo Devid, ebe o si gbapụ. 13Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.