Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O ruo, na mgbe a ga-eduru Merab, ada Sọl dunye Devid, akpọrọ ya nye Adriel, onye Mehola ka ọ lụọ.

1 Samuel 18:19 in English

1 Samuel 18:19 · Berean Standard Bible

So when it was time * to give Saul’s daughter Merab to David, she was given in marriage to Adriel of Meholah.

Context

17Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.” 18Ma Devid sịrị Sọl, “Onyekwanụ ka m bụ, gịnịkwa bụ ezinaụlọ m maọbụ agbụrụ m nʼIzrel, nke m ga-eji bụrụ ọgọ nwoke eze?” 19O ruo, na mgbe a ga-eduru Merab, ada Sọl dunye Devid, akpọrọ ya nye Adriel, onye Mehola ka ọ lụọ. 20Nʼoge a, a chọpụtara na Mikal, ada Sọl hụrụ Devid nʼanya, mgbe e mere ka Sọl mata nke a, obi tọrọ ya ụtọ. 21O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.