1 Samuel 17:45
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.
1 Samuel 17:45 in English
1 Samuel 17:45 · Berean Standard Bible
But David said to the Philistine, “You come against me with sword and spear and javelin, but I come against you in the name of the LORD of Hosts, the God of the armies of Israel, whom you have defied.
Context
43Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ. 44Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” 45Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. 46Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. 47Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.