Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.”

1 Samuel 17:37 in English

1 Samuel 17:37 · Berean Standard Bible

David added, “The LORD, who delivered me from the claws of the lion and the bear, will deliver me from the hand of this Philistine.” “Go,” said Saul, “and may the LORD be with you.”

Context

35achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. 36Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! 37Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.” 38Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi. 39Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.