Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,

1 Samuel 17:34 in English

1 Samuel 17:34 · Berean Standard Bible

David replied, “Your servant has been tending his father’s sheep, and whenever a lion or a bear came and carried off a lamb from the flock,

Context

32Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.” 33Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” 34Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, 35achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. 36Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.