1 Samuel 16:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.
1 Samuel 16:21 in English
1 Samuel 16:21 · Berean Standard Bible
When David came to Saul and entered his service, Saul admired him greatly, and David became his armor-bearer.
Context
19Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.” 20Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl. 21Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl. 22Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.” 23Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.