Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile* kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.

1 Samuel 15:2 in English

1 Samuel 15:2 · Berean Standard Bible

This is what the LORD of Hosts says: ‘I witnessed what the Amalekites did to the Israelites when they ambushed them on their way up from Egypt.

Context

1Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa. 2Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile* kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta. 3Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile* ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ” 4Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.