1 Samuel 15:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel.
1 Samuel 15:17 in English
1 Samuel 15:17 · Berean Standard Bible
And Samuel said, “Although you were once small in your own eyes, have you not become the head of the tribes of Israel? The LORD anointed you king over Israel
Context
15Sọl zara sị, “Ndị agha m si nʼetiti ndị Amalek chịta ụfọdụ nʼime atụrụ na ehi ndị mara mma nke ha chọrọ iji chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ.” 16Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe Onyenwe anyị gwara m nʼabalị!”
Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?” 17Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel. 18Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’ 19Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.