Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile.

1 Samuel 15:11 in English

1 Samuel 15:11 · Berean Standard Bible

“I regret that I have made Saul king, for he has turned away from following Me and has not carried out My instructions.” And Samuel was distressed and cried out to the LORD all that night.

Context

9Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri. 10Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị, 11“Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile. 12Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.” 13Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.