Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.

1 Samuel 14:29 in English

1 Samuel 14:29 · Berean Standard Bible

“My father has brought trouble to the land,” Jonathan replied. “Just look at how my eyes have brightened because I tasted a little of this honey.

Context

27Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite. 28Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ” 29Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara. 30Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?” 31Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.