Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere.

1 Samuel 14:15 in English

1 Samuel 14:15 · Berean Standard Bible

Then terror struck the Philistines in the camp, in the field, and among all the people. Even those in the outposts and raiding parties trembled. Indeed, the earth quaked and panic spread from God.*

Context

13Ya mere, Jonatan ji ikpere ya na aka ya rigoruo nʼebe ahụ; onye na-ebu ihe agha ya sokwa ya nʼazụ. Ma ndị agha Filistia daghachiri azụ mgbe Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya bidoro igbu ha. 14Na ogbugbu mbụ ahụ, Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya gburu ọnụọgụgụ ndị Filistia dị iri abụọ. Ọ bụ nʼihe ha ka nketa ala ruru otu ọkara nʼekaa* nʼọtụtụ. 15Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere. 16Ndị nche Sọl, bụ ndị nọ na Gibea nʼime Benjamin, lepụrụ anya hụ igwe ndị agha ka ha malitere ịgba barịị nʼihu na-azụ. 17Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya na ha so, “Gụọnụ ndị agha ọnụ, chọpụta onye na-anọghị nʼebe a.” Mgbe ha mere nke a, ha chọpụtara, na Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya anọghị nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.