Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.

1 Samuel 12:20 in English

1 Samuel 12:20 · Berean Standard Bible

“Do not be afraid,” Samuel replied. “Even though you have committed all this evil, do not turn aside from following the LORD, but serve the LORD with all your heart.

Context

18Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu. 19Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.” 20Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla. 21Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu. 22Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.