1 Samuel 10:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”
1 Samuel 10:22 in English
1 Samuel 10:22 · Berean Standard Bible
So again they inquired of the LORD, “Has the man come here yet?” And the LORD replied, “Behold, he has hidden himself among the baggage.”
Context
20Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza* mara ebo Benjamin. 21O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya. 22Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?”
Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.” 23Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 24Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!”
Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.