1 Pita 5:3
1 Peter 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
1 Peter 5:3 in English
1 Peter 5:3 · Berean Standard Bible
not lording it over those entrusted to you, but being examples to the flock.
Context
1Mụ onwe m, onye bụ okenye na onyeama banyere ahụhụ Kraịst, bụrụkwa onye ga-eso keta oke nʼebube ya nke a gaje ikpughe, a na m arịọ ndị okenye nʼetiti unu arịrịọ a, 2na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. 3Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ. 4Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe. 5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na,
“Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu,
ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.