1 Pita 3:21
1 Peter 3:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,
1 Peter 3:21 in English
1 Peter 3:21 · Berean Standard Bible
And this water symbolizes the baptism that now saves you also—not the removal of dirt from the body, but the pledge of * a clear conscience toward God—through the resurrection of Jesus Christ,
Context
19Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ. 20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ. 21Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst, 22onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.
3:12 Abụ 34:12-16
3:14 Aịz 8:12
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.