1 Pita 1:21
1 Peter 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.
1 Peter 1:21 in English
1 Peter 1:21 · Berean Standard Bible
Through Him you believe in God, who raised Him from the dead and glorified Him; and so your faith and hope are in God.
Context
19kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị. 20A họpụtara ya tupu e kee ụwa. Kama, ọ bụ nʼọgwụgwụ oge ndị a ka e mere ka ọ pụta ìhè nʼihi unu. 21Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke. 22Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu. 23Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.