Native Bible

1 Peter 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya.

1 Peter 1:11 in English

1 Peter 1:11 · Berean Standard Bible

trying to determine the time and setting to which the Spirit of Christ in them was pointing when He predicted the sufferings of Christ and the glories to follow.

Context

9Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu. 10Banyere nzọpụta a, ndị amụma ahụ kwuru ihe banyere amara ahụ gaje ịbịara unu jiri nnọọ nwayọọ nyochasịa 11ma gbalịsie ike ịchọpụta oge na ọnọdụ ahụ bụ nke Mmụọ Kraịst dị nʼime ha kwuru banyere ya, mgbe ọ gbara ama maka ahụhụ Kraịst na ebube nke ga-eso ya. 12E mere ka ha mata na ọrụ ha na-arụ abụghị maka ọdịmma nke ha onwe ha, kama ọ bụ nʼihi ọdịmma nke unu, mgbe ha kwuru okwu banyere ihe ndị a ahụ bụ ndị a gwarala unu ugbu a site nʼọnụ ndị ziri unu oziọma nʼike Mmụọ Nsọ nke e si nʼeluigwe zite. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi ka ọ gụrụ agụụ ịmata ihe ndị a. 13Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.