1 Ndị Eze 9:5
1 Kings 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
1 Kings 9:5 in English
1 Kings 9:5 · Berean Standard Bible
then I will establish your royal throne over Israel forever, as I promised your father David when I said, ‘You will never fail to have a man on the throne of Israel.’
Context
3Onyenwe anyị sịrị ya,
“Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile. 4“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile, 5mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’ 6“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha, 7mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.