Native Bible

1 Kings 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.

1 Kings 8:6 in English

1 Kings 8:6 · Berean Standard Bible

Then the priests brought the ark of the covenant of the LORD to its place in the inner sanctuary of the temple, the Most Holy Place,* beneath the wings of the cherubim.

Context

4Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja na ndị Livayị buliri ha elu. 5Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba. 6Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ. 7Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, zochie igbe ọgbụgba ndụ ahụ na okporo osisi ndị e ji ebu ya. 8Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na e nwere ike ị site nʼEbe Nsọ, dị nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ isi ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.