Native Bible

1 Kings 8:48 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị;

1 Kings 8:48 in English

1 Kings 8:48 · Berean Standard Bible

and when they return to You with all their heart and soul in the land of the enemies who took them captive, and when they pray to You in the direction of the land that You gave to their fathers, the city You have chosen, and the house I have built for Your Name,

Context

46“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro ha, ndị dọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso; 47ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe ahụ eji ha rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, anyị emekwala ajọ omume’; 48ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndị iro ha, bụ ndị dọọrọ ha nʼagha, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị; 49mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha, nyekwara ha aka. 50Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị, gbaghara njehie niile ha mere megide gị, ma meekwa ka ndị dọtara ha nʼagha gosi ha obi ebere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.