1 Ndị Eze 8:42
1 Kings 8:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
1 Kings 8:42 in English
1 Kings 8:42 · Berean Standard Bible
for they will hear of Your great name and mighty hand and outstretched arm—when he comes and prays toward this temple,
Context
40ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha. 41“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi Aha gị, 42nʼihi na ha ga-anụ ihe banyere aha ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a, 43mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme, ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru. 44“Mgbe ndị gị ga-aga ibu agha megide ndị iro ha, nʼebe ọbụla ị na-eziga ha, mgbe ha chere ihu ha nʼụzọ obodo a nke ị họpụtara na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị, kpee ekpere nye Onyenwe anyị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.