1 Ndị Eze 7:9
1 Kings 7:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya.
1 Kings 7:9 in English
1 Kings 7:9 · Berean Standard Bible
All these buildings were constructed with costly stones, cut to size and trimmed with saws inside and out from the foundation to the eaves, and from the outside to the great courtyard.
Context
7E nwekwara ọnụ ụlọ ọzọ a na-akpọ, Ụlọ Ocheeze, maọbụ Ụlọ Ikpe ziri ezi ebe Solomọn na-anọ ekpe ikpe. E ji osisi sida machie ahụ ya niile, site nʼala ruo nʼelu. 8Ụlọ obibi Solomọn dịkwa nʼogige dị nʼazụ ụlọ ikpe a. E wukwara ya dịka e si wuo ụlọ ndị ọzọ. Solomọn wukwaara nwunye ya ụlọ yiri nke ya. Nwanyị a bụ nwa Fero, eze ndị Ijipt, nke Solomọn na-alụ. 9E ji nkume dị mma ma dịkwa oke ọnụahịa nke a wara awa na nke a kwadoro nke ọma nʼime na nʼezi dịka ọtụtụ si dị, wuo ụlọ ndị a. Site na ezi ruo nʼogige ukwu ahụ ma sitekwa na ntọala ruo nʼelu ya. 10Nkume e ji tọọ ntọala ụlọ ndị a bụ nkume buru ibu, ndị dị ezi mma. Ụfọdụ nʼime nkume ndị a ruru mita anọ na ọkara nʼogologo, ndị ọzọ dị mita atọ na ụma isii. 11Nʼelu nkume ndị a ka e doro nkume ndị ọzọ, ndị dị ezi mma, a waziri awazi dịka ọtụtụ si dị. Emesịa, e dokwara osisi sida nʼelu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.