Native Bible

1 Kings 7:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe.

1 Kings 7:35 in English

1 Kings 7:35 · Berean Standard Bible

At the top of each stand was a circular band half a cubit high.* The supports and panels were cast as a unit with the top of the stand.

Context

33E mekwara ụkwụ ndị a dịka ụkwụ ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ. Ọ bụkwa ọla ka e ji kpụọ akụkụ ihe ndọkwasị ahụ niile, ma okporo igwe ukwu, ma okporo igwe nta, na ihe niile jikọtara ha. 34Ụkwụ ọla nta anọ dịkwa nʼokpuru ihe ndọkwasị ahụ, nʼakụkụ ọbụla. A wụkọtakwara ha na ihe ndọkwasị ahụ. 35E nwere ihe a magidere gburugburu nʼelu ihe ndọkwasị ọbụla, nke omimi ya dị iri sentimita abụọ na ụma atọ. Ọla a, na ụkwụ ya, ka a wụkọtara na ihe ndọkwasị ahụ otu mgbe. 36Ebe ọbụla ohere dị, o gbunyere oyiyi cherubim nwere nku, na oyiyi ọdụm, na oyiyi osisi nkwụ, nʼahụ ibo ọla ahụ e mere ka ọ dịrị gburugburu elu ihe ndọkwasị ọla ahụ. 37Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.