1 Ndị Eze 7:22
1 Kings 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ.
1 Kings 7:22 in English
1 Kings 7:22 · Berean Standard Bible
And the tops of the pillars were shaped like lilies. So the work of the pillars was completed.
Context
20Nʼelu ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼogidi abụọ ahụ, nʼelu elu ha, ebe ahụ yiri ọnụ ite mmiri nke dị nʼakụkụ ihe ọkpụkpụ ọla ahụ, e nwere ihe yiri narị mkpụrụ pomegranet abụọ e doro nʼahịrị nʼahịrị gburugburu ha. 21O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ na mgbe ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz. 22Ihe ọkpụkpụ ọla dị nʼelu ogidi ndị a bụ nke yiri okoko osisi lili. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka e si rụzuo ọrụ niile metụtara ogidi ndị ahụ. 23O mekwara Oke osimiri* nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu. 24Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ọba gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ọba ndị a dị nʼahịrị abụọ, awụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.