Native Bible

1 Kings 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.

1 Kings 6:10 in English

1 Kings 6:10 · Berean Standard Bible

He built chambers all along the temple, each five cubits high and attached to the temple with beams of cedar.

Context

8Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ. 9Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ. 10O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara. 11Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị, 12“Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.