1 Ndị Eze 5:7
1 Kings 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”
1 Kings 5:7 in English
1 Kings 5:7 · Berean Standard Bible
When Hiram received Solomon’s message, he rejoiced greatly and said, “Blessed be the LORD this day! He has given David a wise son over this great people!”
Context
5Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’ 6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.” 7Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.” 8Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị,
“Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa. 9Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.