1 Ndị Eze 4:33
1 Kings 4:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ.
1 Kings 4:33 in English
1 Kings 4:33 · Berean Standard Bible
He spoke of trees, from the cedar in Lebanon to the hyssop growing in the wall, and he taught about animals, birds, reptiles, and fish.
Context
31Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu. 32Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise. 33O kwuru okwu banyere osisi, site na osisi sida nke Lebanọn ruo nʼahịhịa hisọp nke na-eto na mgbidi aja, na ihe banyere ụmụ anụmanụ na anụ ufe, na anụ na-akpụgharị nʼala nakwa azụ. 34Ndị eze niile dị nʼụwa bụ ndị bịara ịnụrụ banyere amamihe ya zitere ndị si na mba niile dị iche iche ịnụrụ okwu amamihe Solomọn.
4:2 Zadọk mụrụ Ahimaaz, Ahimaaz a mụọ Azaraya. Ya mere, Zadọk ji bụrụ nna nna Azaraya. Azaraya bụ onyeisi nchụaja nʼIzrel nʼafọ niile Solomọn chịrị, nʼihi na mgbe ahụ Ahimaaz anwụọla. 2Sa 15:27,36; 1Ih 6:8-9
4:21 Oke alaeze niile Solomọn bụ dịka Chineke kweere ya Ebraham na nkwa Jen 15:18-21; Dit 17; 11:24; Jos 1:4.
4:23 Ya bụ, ụgbala mmiri
4:24 Tifsa ruo na Gaza, bụ obodo dị nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu. Ọ bụ oke alaeze Solomọn nʼugwu, bụrụkwa obodo dị mkpa nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Gaza na Filistia bụ obodo ndị dị nso nʼosimiri Mediterenịan. Ha bụ oke ala nʼọwụwa anyanwụ nke ndịda alaeze ahụ.
4:25 Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya Nke a pụtara nʼezinaụlọ ọbụla, biri nʼudo na nchekwa nʼụlọ ha. Jer 23:6.
4:26 Dit 17:16
4:30 Ebe a, na-ekwu banyere ebo ndị Arab bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Palestia. Jen 25:6; Nkp 6:3,33; 7:12; 8:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.