1 Ndị Eze 4:30
1 Kings 4:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ.* Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt.
1 Kings 4:30 in English
1 Kings 4:30 · Berean Standard Bible
Solomon’s wisdom was greater than that of all the men of the East, greater than all the wisdom of Egypt.
Context
28Ha na-ewetakwa ọka balị na ahịhịa ọka nʼebe o kwesiri, maka ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọ agha na ịnyịnya ụkwụ ọsọ ndị ọzọ dịka ihe ha ketara nʼụtụ si dị. 29Chineke nyere Solomọn amamihe, na uche nghọta, na mmụọ ịmụta ọtụtụ ihe nke bara ụba dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. 30Amamihe Solomọn dị ukwuu karịa amamihe ndị si ọwụwa anyanwụ.* Nʼezie, ọ dị ukwuu karịakwa amamihe ndị maara ihe nʼIjipt. 31Ọ maara ihe karịa onye ọbụla, karịa Etan onye Ezra, na Heman, na Kalkol, na Dada, ụmụ ndị ikom Mahol. Ihe banyere ịdị ukwuu ya gbasara na mba niile gbara ha gburugburu. 32Ọ tụrụ puku ilu atọ, deekwa abụ ọnụọgụgụ ha dị otu puku na ise.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.