1 Ndị Eze 3:8
1 Kings 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke.
1 Kings 3:8 in English
1 Kings 3:8 · Berean Standard Bible
Your servant is here among the people You have chosen, a people too numerous to count or number.
Context
6Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa. 7“Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị* na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa.* 8Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. 9Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” 10Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.