1 Ndị Eze 3:2
1 Kings 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị.
1 Kings 3:2 in English
1 Kings 3:2 · Berean Standard Bible
The people, however, were still sacrificing on the high places because a house for the Name of the LORD had not yet been built.
Context
1Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ Onyenwe anyị, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu. 2Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị. 3Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe Onyenwe anyị nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche. 4Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.