1 Ndị Eze 3:12
1 Kings 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị.
1 Kings 3:12 in English
1 Kings 3:12 · Berean Standard Bible
behold, I will do what you have asked. I will give you a wise and discerning heart, so that there has never been nor will ever be another like you.
Context
10Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. 11Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. 12Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị. 13Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile. 14Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.