Native Bible

1 Kings 22:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ.

1 Kings 22:51 in English

1 Kings 22:51 · Berean Standard Bible

In the seventeenth year of Jehoshaphat’s reign over Judah, Ahaziah son of Ahab became king of Israel, and he reigned in Samaria two years.

Context

49Nʼoge ahụ, Ahazaya nwa Ehab sịrị Jehoshafat, “Kwere ka ndị ikom m soro ndị ọrụ gị nʼụgbọ gị,” ma Jehoshafat ekweghị. 50Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid, nna ya. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 51Ahazaya nwa Ehab, malitere ịbụ eze Izrel na Sameria, nʼafọ iri na asaa nke ọchịchị Jehoshafat, eze Juda. Ma ọ chịrị Izrel naanị afọ abụọ. 52O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na o sooro ụzọ ọjọọ niile nke nna na nne ya, na ụzọ ọjọọ nke Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel mee mmehie. 53Ọ fekwara arụsị Baal ofufe, kpọọkwa isiala nye ya, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, Chineke Izrel iwe, dịka nna ya mere. 22:8 Nke a, abụghị onye dere akwụkwọ Maika, nke bụ otu akwụkwọ nʼime akwụkwọ nsọ 22:14 Ọnụ 22:38; 24:13 22:34 Eleghị anya ebe uwe agha ya na-ekpuchiteghị 22:38 1Ez 21:19

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.