Native Bible

1 Kings 22:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel.

1 Kings 22:44 in English

1 Kings 22:44 · Berean Standard Bible

Jehoshaphat also made peace with the king of Israel.

Context

42Jehoshafat gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi. 43Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile. 44Jehoshafat mere ka udo dị nʼetiti ya na eze Izrel. 45Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Jehoshafat, ihe niile ndị ọ rụpụtara, ike ọ kpara nʼọtụtụ agha nke o buru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 46O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.